Pastọ Agwọ uchichi bụ Agụ-Owuru
Ma bụrụkwa ezigbo Senti nwa-Egbe
Agwọ Uchichi bụ adigboroja Pastọ
Ọ bu onye isi ndị niile neme ọkanga
Ma bụrụkwa Nna ndị ụgha niile
Ọ naghi ezu ori maọli maọli
Mana Ọ gafee, ihe efuo na-ogbe
Agwọ uchichi bu Agabaidu nke mbụ.
Agwọ uchichi nwere ngabasị ọjọọ
Ọ bụ Onye isi ndi Ajọ otu n’uwa niile
Nwoke a bụ soro okwu ọnụm
Ma Gi esokwala omumem niile
Eze Ndi I were nkaa, I riem ego
I were nkaaa, ego gi alaariela.
Onye hụrụ Pastọ ahụla okwu na ụka
Pastọ bụ anụ kpọrọ nkụ neju ọnụ
Pastọ bụ Ji ahụrụ n’ọkụ nefu ome
Ọ bụkwa dike anakpa ogwu n’anya
Bụrụkwa O ji Isi aghọ mkpụrụ mgbọ
Pastọ a bụkwa ezigbo ọnyika- ọdọrụ.
Ọ bụkwa Onye isi ndị O sochi egbụ
Agwọ uchichi bụ Ọ kwọm n’azụ ya,
Mana ụkwụm na-akpụ n’aja
Agwọ uchichi bụ meremere n’iru
Agwọ uchichi bụkwa gwọmpịtị n’azụ
Agwọ a bụ soro mụọ gbuo mmadụ
Ma soro mmadụ pụta izu akwa.
Agwọ uchichi jọkarịrị Udele na njọ
Ma sigbukwa nwa Nkapị n’Isi Isi ọjọọ
Agwọ a bụ ọ dị ime amụ arụrụmala
Abali agba aka nke mbụ gburugburu
Mkpị nsọ na agbalụ ọra nke mbụ
Arakata nke mbụ n’ụwa gburugburu.
Oziọma ya bụ, burunu baibụl n’amụ
Maka na ụwa niile nachọzikwa Ikpụ
Agwọ uchichi bụ kama ọ gadọ n’ite
Ka ọdọrọ n’afọ, ụwa a bụ ofu mbia
N’ụlọ awantilọ ka ebe obibi ya dị
Yana n’ụlọ ndị ụmụnwanyị ajadu
Agwọ uchichi bụ papa ịkwọkịrịkwọ.
Ajọ dibia a ji nsi na aja eme ọjị ụtụtụ
Pastọ Agwọ uchichi ji obi ya akọ nsi
O ji ọnụ ya atagbu, were obi akọcha
O yi awoọrọ atụrụ, nasị udo na ndụ
Ma nanị nsogbu na ọnwụ ka ọ nenye
Agwọ uchichi nezi oziọma Ala-Eze
Ma Ọ bụ Eze ndi ọjọọ, ndi arụrụmala.
© Ọnọchiengwu Ọbụna.
-Advertisement-
Grab our latest Magazine, "Hon. Chief C.O.C Akaolisa gets justice". Get your order fast and stress free.
For more details about Newswire Law&Events Magazine, kindly reach out to us on 08039218044, 09070309355. Email: newswiremagazine@yahoo.co.uk. You will be glad you did